66 Inyinya-ha di nnù na ọgu iri-na-isi na iri na isi; inyinya mule ha di ọgu iri-na-abua na ise;
67 camel-ha di nnù na orú na iri na ise; inyinya-ibu-ha di nnù iri-na-isi na ọgu iri-na-isi.
68 Ma ufọdu n'etiti ndi-isi ulo nke ndi bu nna, mb͕e ha biaruru ulo Jehova nke di na Jerusalem, ha nyere onwe-ha n'afọ-ofufo iwu ulo Chineke ime ka o guzo n'ọnọdu-ya:
69 dika ike-ha si di ka ha tiyere n'ulo-àkù nke ije-ozi ahu orú nnù daric ọla-edo uzọ asa na nnù iri-na-abua na ọgu iri, na nnù pound ọla-ọcha iri-na-abua na ọgu iri, na ọgu uwe ndi-nchu-àjà ise.
70 Ndi-nchu-àjà, na ndi Livai, na ufọdu nime ndi Juda, na ndi-ọbù-abù, na ndi-ọnu-uzọ-ama, na Netinim, we biri n'obodo nile ha, Israel nile bi-kwa-ra n'obodo nile ha.