21 Ub͕u a nyenu iwu ime ka ndikom a kwusi, ka aghara kwa iwu obodo a, rue mb͕e m'gēnye iwu.
22 Lezi-kwa-nu anya ka nmehie ghara idi n'ime ihe a: n'ìhi gini ka ihe ọjọ a gādi uku ime ka ihe funari ndi-eze.
23 Mb͕e ahu site na mb͕e aguru ndeputa akwukwọ-ozi nke Ataksakses, bú eze, n'iru Rehum, na Shimshai, bú ode-akwukwọ, na ndi-òtù-ha, ha were ngwa ngwa jerue Jerusalem, jekuru ndi-Ju, were ihe-ike na usu-ndi-agha me ka ha kwusi.
24 Mb͕e ahu ọlu ulo Chineke nke di na Jerusalem kwusiri; o we kwusi rue arọ nke-abua nke ọbubu-eze nke Daraiọs, bú eze Peasia.