13 Mb͕e ahu Tatenai, bú onye nāchi ala n'ofè osimiri, na Sheta-bozenai, na ndi-òtù-ha, dika ozi ahu si di nke Daraiọs, bú eze, ziri, otú a ka ha were ngwa ngwa me.
14 Ma ndi-okenye nke ndi-Ju nēwu ulo, ihe nāga-kwa-ra ha nke-ọma, site n'ibu-amuma nke Hagai, bú onye-amuma, na Zekaraia nwa Ido. Ha we wue, wuzu kwa ya, site n'ihe Chineke Israel nyere n'iwu, na site n'ihe Sairọs na Daraiọs na Ataksakses, bú eze Peasia, nyere n'iwu.
15 Ma n'ubọchi nke-atọ nke ọnwa Ada, nke di n'arọ nke-isi nke ọbubu-eze Daraiọs, bú eze, ka ewuchara ulo a.
16 Umu Israel, bú ndi-nchu-àjà, na ndi Livai, na ndi fọduru n'umu ndi emere ka ha je biri n'ala ọzọ, were ọṅù me ememe nke irara ulo a nke Chineke nye Chineke.
17 Ha we weta nso n'irara ulo a nke Chineke nye Chineke ọgu oke-ehi ise, na ọgu ebulu iri, na nnù umu-aturu; na nkpi iri-na-abua, iji churu Israel nile àjà-nmehie, dika nguta nke ebo nile nke Israel si di.
18 Ha we guzo ndi-nchu-àjà nime nkewa-ha, na ndi Livai n'òkè-ha, bayere òfùfè Chineke, nke di na Jerusalem; dika edere ya n'akwukwọ Moses.
19 Umu ndi emere ka ha je biri n'ala ọzọ we me ememe ngabiga n'ubọchi nke-iri-na-anọ nke ọnwa mbu.