22 N'ihi na emerem ihere iriọ n'aka eze usu-ndi-agha na ndi-inyinya iyere ayi aka n'ihi onye-iro nke di n'uzọ: n'ihi na ayi gwara eze okwu, si, Aka Chineke-ayi di n'aru ndi nile nāchọ Ya, ime ha nma; ma ike-Ya na iwe-Ya nēmegide ndi nile nārapu Ya.
23 Ayi we bue ọnu, riọ Chineke-ayi aririọ bayere nka: O we kwe ka ayi riọta ihe ayi riọrọ.
24 M'we kewaputa na ndi-isi nke ndi-nchu-àjà madu iri na abua, bú Sherebia na Hashabaia, ha na madu iri ndi sitere n'umu-nne-ha,
25 m'we tùara ha ọla-ọcha ahu, na ọla-edo ahu, na ihe ahu nile, bú àjà-nbuli nke ulo Chineke-ayi, nke eze, na ndi nādu ya ọdu, na ndi-isi-ya, na Israel nile ahuru n'ebe ahu, buliri:
26 m'we tùa nye ha n'aka nnù talent ọla-ọcha na ọgu iri-na-abua na iri, na ọgu talent ihe ọla-ọcha ise; na ọgu talent ọla-edo ise;
27 na orú ọkwa ntà ọla-edo, ọtùtù-ha bu nnù daric abua na ọgu iri; na ihe abua nke ezi ọla nācha edo edo, bú ihe anāchọsi ike dika ọla-edo.
28 M'we si ha, Unu onwe-unu bu ihe nsọ Jehova nwere, ihe ndia bu kwa ihe nsọ; ọla-ọcha na ọla-edo bu kwa onyinye-afọ-ofufo enyere Jehova, bú Chineke nke nna-unu-hà.