12 unu onwe-unu emewo kwa ihe ọjọ kari nna-unu-hà; n'ihi na, le, unu nējeso, onye ọ bula isi-ike nke obi ọjọ ya unu we ghara igem nti:
13 M'gātupu kwa unu n'elu ala nka tukwasi unu n'ala ahu nke unu nāmaghi, ma ọ bu unu onwe-unu ma -ọbu nna-unu-hà; unu gēfè kwa chi ọzọ di iche iche n'ebe ahu ehihie na abali; n'ihi na M'gaghi-emere unu amara.
14 N'ihi nka, le, ubọchi nābia, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), na agaghi-asi kwa ọzọ, Jehova nādi ndu, bú Onye mere ka umu Israel si n'ala Ijipt rigoputa;
15 kama agāsi, Jehova nādi ndu, bú Onye mere ka umu Israel si n'ala Ugwu na n'ala nile ebe Ọ chusara ha-ri rigoputa: M'gēme kwa ka ha lata n'ala ahu nke M'nyere ndi bu nna-ha.
16 Le, M'gaje iziga kpọ ọtutu ndi-ọ́kù, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), ha gākùru ha; emesia M'gēziga kpọ ọtutu ndi-ntá, gēsi n'elu ugwu ọ bula, na n'elu ugwu ntà ọ bula, na nime nb͕awa nkume nile di elu, chu ntá ha.
17 N'ihi na anyam abua dikwasi n'uzọ nile ha: ezopughi ha n'irum, ezobeghi kwa ajọ omume-ha pua n'iru anyam abua.
18 Ma M'gēburu uzọ kwughachi ajọ omume-ha na nmehie-ha okpukpu abua; n'ihi na ha emewo alam ka ọ ghara idi nsọ n'ozu nke nile ha nke nāsọ oyi, ọ bu kwa ihe-árú nile ha ka ha ji kpojue ihe-nketam.