5 Ndi ahu we si Jeremaia, Ka Jehova buru onye-àmà nēkwu ezi-okwu nke kwesi-kwa-ra ntukwasi-obi n'etiti ayi, ọ buru na ọ bughi dika okwu ahu nile si di, nke Jehova, bú Chineke-gi, gēzite gi ka i were ya biakute ayi, otú a ka ayi gēme.
6 Ma ọ di nma ma ọ jọrọ njọ, olu Jehova, bú Chineke-ayi, ka ayi gēge nti, bú Onye ayi onwe-ayi nēziga gi ijekuru; ka o we diri ayi nma, mb͕e ayi nēge nti olu Jehova, bú Chineke-ayi.
7 O rue, mb͕e ubọchi iri gwusiri, na okwu Jehova ruru Jeremaia nti.
8 O we kpọ Johanan nwa Karea, na ndi-isi nile nke usu nile nke ndi-agha so ya, na ndi Israel nile site n'onye dikarisiri ntà we rue onye dikarisiri uku,
9 si ha, Otú a ka Jehova, bú Chineke nke Israel, Onye unu zigaram ijekuru ime ka aririọ-amara-unu da n'iru Ya, siri:
10 Ọ buru na unu ebiri n'ala nka, M'gēwu kwa unu dika ulo, ghara ikwada unu, M'gāku kwa unu dika osisi, ghara iropu unu: n'ihi na echeghariwom n'ihe ọjọ ahu nke M'meworo unu.
11 Unu atula egwu eze Babilon, onye unu onwe-unu nātu egwu ya; unu atula egwu ya, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta): n'ihi na unu ka M'nọyere, izọputa unu, na inaputa unu n'aka-ya.