4 Ọzọ kwa, gini ka unu gēmem, unu Taia na Zaidon na buruburu-ala nile nke Filistia? Ọ̀ di nmeso M'mesoworo unu unu onwe-unu nākwughachim, ma ọ̀ bu na ihe di unu onwe-unu nēmesom? M'gēji ngwa na ọsọ nyeghachi nmeso-unu n'isi-unu.
5 Ebe ọ bu ọla-ọcham na ọla-edom ka unu wereworo, ebe ọ bu kwa ezi ihem nile anāchọsi ike ka unu chibàworo n'ulo uku nile unu;
6 ebe ọ bu kwa umu Juda na umu Jerusalem ka unu nēre nye umu ndi Jevan, ka unu we me ka ha si n'ókè-ala-ha je n'ebe di anya:
7 le, M'gaje isi n'ebe ahu ebe unu nērega ha-ri kpọte ha, nyeghachi nmesò-unu n'isi-unu;
8 M'gēre kwa umu-unu ndikom na umu-unu ndinyom nye n'aka umu Juda, ha ewe re ha nye ndi Sheba, bú mba di anya: n'ihi na Jehova ekwuwo.
9 Kpọsanu nka n'etiti mba nile; donu agha nsọ: kpọtenu ndi-dike; ka ndi-agha nile biarue nso, rigota.
10 Kpugharianu mma-ọgè-unu ka ha buru mma-agha, na mma-ikwa-osisi-unu ka ha buru ube: ka onye-ume-ngwu si, Dike ka m'bu.