4 Unu ewe mara na eziteworom unu ihe a enyere n'iwu, ka ọḅuḅa-ndum we diyere Livai, ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri.
5 Ọgbugha-ndum diyere ya, bú ndu na udo; M'we nye ya ha dika ihe-egwu, o we tua egwum, ọ bu kwa aham ka ya onwe-ya turu ujọ ya.
6 Iwu nke ezi-okwu di n'ọnu-ya, ahughi kwa ajọ omume n'eḅuḅere-ọnu-ya: n'udo na n'izi-ezi ka o sorom je ije, ọ di kwa ọtutu madu o mere ka ha si n'ajọ omume chigharia.
7 N'ihi na eḅuḅere-ọnu abua nke onye-nchu-àjà gēdebe ihe-ọmuma, ọ bu kwa iwu ka ha gāchọ n'ọnu-ya: n'ihi na onye-ozi nke Jehova nke usu nile nke ndi-agha ka ọ bu.
8 Ma unu onwe-unu ewezugawo onwe-unu n'uzọ Chineke; unu emewo ka ọtutu madu su ngọngọ n'iwu; unu ebibiwo ọḅuḅa-ndu Livai, ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri.
9 Ma Mu onwem emewo kwa ka unu buru ndi anēlelì na ndi di ala n'iru ndim nile, dika unu nādighi-esi edebe uzọm nile, kama unu nāhu madu iru-ọma n'iwu.
10 Ọ̀ bughi otù Nna ka ayi nile nwere? ọ̀ bughi otù Chineke keworo ayi? gini mere ayi nāghọḅu, onye ọ bula ọ ghọḅu ibe-ya, nēme ka ọḅuḅa-ndu nna-ayi-hà ghara idi nsọ?