31 Asha anapughi kwa ndi bi n'Ako, na ndi bi na Zaidon, na Ahlab, na Akzib, na Helba, na Afik, na Rehob, ala-ha:
32 ndi Asha we biri n'etiti ndi Kenean, bú ndi bi n'ala ahu: n'ihi na ha anapughi ha ala-ha.
33 Naftali anapughi kwa ndi bi na Bet-shemesh, na ndi bi na Bet-anat, ala-ha; ha we biri n'etiti ndi Kenean, bú ndi bi na n'ala ahu: ma ndi bi na Bet-shemesh na Bet-anat ghọrọ ndi nēfè ha òfùfè.
34 Ndi-Amorait we kpagide umu Dan n'ugwu: n'ihi na ha ekweghi ka ha rida na ndagwurugwu:
35 ma ndi-Amorait jisiri ike ibiri n'ugwu Heres, na n'Ajalon, na nime Shaalbim: ma aka ulo Josef dikariri arọ́, ha we ghọ ndi nọ n'ifè-òfùfè.
36 Ókè-ala ndi-Amorait we site na nrigo Akrabim, site na ukume di elu ahu, we rigo.