17 Israel we zìe ndi-ozi jekuru eze Edom, si, Biko, ka m'gabiga nime ala-gi: ma eze Edom egeghi nti. Ọzọ kwa, o ziri ndi-ozi jekuru eze Moab: ma ọ kwegh: Israel we nọdu na Kedesh.
18 O we je ije n'ọzara, ga ala Edom na ala Moab buruburu, biarue akuku ọwuwa-anyanwu ala Moab, ha we ma ulo-ikwū-ha n'ofè Anon; ma ha abaghi n'ókè-ala Moab, n'ihi na Anon bu ókè-ala Moab.
19 Israel we zìe ndi-ozi jekuru Saihon, bú eze ndi-Amorait, bú eze Heshbon; Israel we si ya, Biko, ka ayi gabiga nime ala-gi rue ebe nkem.
20 Ma Saihon atukwasighi Israel obi igabiga nime ókè-ala-ya: ma Saihon chikọtara ndi-ya nile, ha we ma ulo-ikwū-ha na Jehaz, o buso Israel agha.
21 Jehova, bú Chineke Israel, we nye Saihon na ndi-ya nile n'aka Israel, ha we tib͕ue ha: Israel we nweta ala nile nke ndi-Amorait, bú ndi bi n'ala ahu.
22 Ha we nweta ókè-ala nile nke ndi-Amorait, site n'Anon we rue Jabok, site kwa n'ọzara we rue Jọdan.
23 Ma ub͕u a Jehova, bú Chineke Israel, anapuwo ndi-Amorait ala-ha n'iru ndi-Ya, bú Israel, ọ̀ bu kwa gi onwe-gi gēnweta ha?