4 O rue, mb͕e nka gasiri, na ọ huru otù nwayi n'anya na ndagwurugwu Sorek, onye aha-ya bu Delaila.
5 Ndi-isi ndi Filistia we rigokuru ya, si ya, Rà ya ọnu, hu ihe ọ bu, bú nke ike uku ya di nime ya, na ihe ayi gēji pu imegide ya, ka ayi we ke ya ab͕u iweda ya n'ala: ayi onwe-ayi gēnye kwa gi, nwoke ọ bula nime ayi, nnù ọla-ọcha abua na ọgu iri-na-ise.
6 Delaila we si Samson, Biko, gosim ihe ọ bu, bú nke ike uku gi di nime ya, na ihe agēji ke gi ab͕u iweda gi n'ala.
7 Samson we si ya, Ọ buru na ha ewere akwara ọhu asa nke anāmikọghi amikọ kem ab͕u, m'gābu kwa onye nādighi ike, di kwa ka madu ọ bula si di.
8 Ndi-isi Filistia we chigoro Delaila akwara ọhu asa nke anāmikọghi amikọ, o we were ha ke ya ab͕u.
9 Ma o nwere ndi nēche anwu nānọdu n'ime-ulo. O we si ya, Ndi Filistia nādakwasi gi, Samson. O we dọbìe akwara asa ahu, dika anādọbì eriri-nzuzu mb͕e aṅara ya ọku. Amaghi kwa ike-ya.
10 Delaila we si Samson, Le, i kwawom emò, gwam okwu-ugha: biko, gosim ub͕u a ihe agēji ke gi ab͕u.