11 N'ebe dipuru anya n'olu ndi-uta, n'etiti ebe isere miri,N'ebe aku ka ha gākọ akukọ ezi omume nile nke Jehova,Bú ezi omume nile O mere obodo ntà Ya n'Israel.Mb͕e ahu ndi Jehova ridara rue ọnu-uzọ-ama nile.
12 Teta, teta, Debora;Teta, teta, kwue okwu abù:Bilie, Berak, dọta usu ndi i dọtara n'agha n'agha, gi nwa Abinoam.
13 Mb͕e ahu ndi fọduru nime ndi di ike nke-uku, bú ndi Israel, ridara;Jehova ridara n'ihim imegide ndi-dike.
14 Ndi nkpọrọgwu-ha di nime Amalek siri n'Efraim rida;Nēso gi n'azu, Benjamin, n'etiti umu-nna-gi.Ndi-ònyé-ukpuru siri na Makia rida,Ndi ji nka-n'aka ode-akwukwọ ese ihe si-kwa-ra na Zebulun rida.
15 Ndi-isi n'Isaka nọye-kwa-ra Debora;Dika Isaka si di, otú a ka Berak di;Na ndagwurugwu ka ezigara ya n'ukwu-ya abua.Na miri-iyi nile nke ReubenKa oké nzube obi di.
16 N'ìhi gini ka i nọduru n'etiti ogige-aturu-gi,Inu ob͕ub͕u-ọ̀jà anēb͕uru ìgwè aturu?Na miri-iyi nile nke ReubenKa oké nnyocha obi di.
17 Gilead biri n'ofè Jọdan:Dan kwa, n'ìhi gini ka ọ nọ n'ub͕o?Asha nọduru n'ọnu-miri oké osimiri,Ọ bu kwa n'akuku ọwara-miri-ya nile ka o nēbi.