12 Ma ndi Midian na ndi Amalek na umu Iru-anyanwu nile nāmade nime ndagwurugwu ahu dika igurube n'uba; iguta-ọgugu adighi kwa camel-ha, dika ájá nke di n'usọ oké osimiri n'uba.
13 Gideon we bia, ma, le, otù nwoke nēzere ibe-ya nrọ, si, Le, arọrọm nrọ, ma, le, buruburu achicha ọka barley nākpọre ba n'ọmuma-ulo-ikwū Midian, ọ biarue ulo-ikwū, tie ya, o we da, achicha ahu we me ka o kpue iru, ulo-ikwū ahu we tọb͕ọ n'ala.
14 Ibe-ya we za, si, Nka abughi ihe ọzọ ma-ọbughi mma-agha Gideon nwa Joash, bú nwoke Israel: Chineke enyewo Midian na ọmuma-ulo-ikwū-ya nile n'aka-ya.
15 O rue, mb͕e Gideon nuru ọzize nrọ ahu na akukọ-isi-ya, na ọ kpọrọ isi ala; o we laghachi n'ọmuma-ulo-ikwū Israel, si, Bilienu; n'ihi na Jehova enyewo ọmuma-ulo-ikwū Midian n'aka unu.
16 O we kewa ọgu ndikom iri-na-ise ahu n'usu atọ, o tiye n'aka-ha nile opì-ike, na ite nke ihe nādighi nime ha, na ọwa n'etiti ite ahu.
17 Ọ si ha, Lenum anya, me-kwa-unu otú a: ma, le, mb͕e mu onwem nābà na nsọtu ọmuma-ulo-ikwū-ha, ọ gēru kwa na, dika m'nēme, otú a ka unu gēme.
18 Mb͕e m'fùru opì-ike, mu onwem na ndi nile nke sorom, unu gāfù kwa opì-ike, ọbuná unu onwe-unu, buruburu ọmuma-ulo-ikwū ahu nile, si, Ayi diri Jehova, di-kwa-ra Gideon.