18 Ọ si Zeba na Zalmuna, Ndikom ahu nke unu b͕uru nime Teboa, hà di aṅa? Ha si, Dika i di, otú a ka ha di; onye ọ bula di ka umu eze n'aru.
19 Ọ si, Umu-nnem, bú umu-ndikom nnem muru, ka ha bu: Jehova nādi ndu! asi na unu emewo ka ha di ndu, agaghm-eb͕uwori unu.
20 O we si Jeta, bú ọkpara-ya, Bilie, b͕ue ha. Ma nwa-okoro ahu amiputaghi mma-agha-ya: n'ihi na ọ nātu egwu, n'ihi na nání nwa-okoro ka ọ bu rue mb͕e ahu.
21 Zeba na Zalmuna we si, Gi onwe-gi bilie, dakwasi ayi: n'ihi na dika nwoke si di, otú a ka idi-ike-ya di. Gideon we bilie, b͕ue Zeba na Zalmuna, were ihe nile yiri ọnwa nke di n'olu camel-ha.
22 Ndikom Israel we si Gideon, Nāchi ayi, ma gi onwe-gi, ma nwa-gi nwoke, ma nwa nwa-gi: n'ihi na i zọputawo ayi n'aka Midian.
23 Gideon we si ha, Mu onwem agaghi-achi unu, nwam agaghi-achi kwa unu: Jehova gāchi unu.
24 Gideon we si ha, Ka m'riọ unu aririọ, nye-kwa-num, nwoke ọ bula nb͕a-aka nke ihe-nkwata-ya. (N'ihi ma ha nwere nb͕a-aka ọla-edo, n'ihi na ndi Ishmael ka ha bu.)