23 Gideon we si ha, Mu onwem agaghi-achi unu, nwam agaghi-achi kwa unu: Jehova gāchi unu.
24 Gideon we si ha, Ka m'riọ unu aririọ, nye-kwa-num, nwoke ọ bula nb͕a-aka nke ihe-nkwata-ya. (N'ihi ma ha nwere nb͕a-aka ọla-edo, n'ihi na ndi Ishmael ka ha bu.)
25 Ha si, Ayi gēnye ha nọ̄. Ha we b͕asa uwe, tubà n'ebe ahu, nwoke ọ bula nb͕a-aka nke ihe-nkwata-ya.
26 Ọtùtù nb͕a-aka ọla-edo nile nke ọ riọrọ we di nnù shekel ọla-edo anọ na ọgu ise; nāgughi ihe nile yiri ọnwa, na ihe nile anākwuba na nti, na uwe ododo nile nke di n'aru ndi-eze Midian, nāgughi kwa ihe-inya-n'olu nile nke di n'olu camel-ha.
27 Gideon we me ya ka ọ buru ephod, guzo ya ọtọ n'obodọ-ya, bú Ọfra: Israel nile we soro ya nākwa iko n'ebe ahu: o we ghọrọ Gideon, ghọ-kwa-ra ulo-ya, ọnyà.
28 Ewe me ka Midian ruru ala n'iru umu Israel, ha ewelighi kwa isi-ha ọzọ. Ala we di jū ọgu arọ abua n'ub͕ochi Gideon.
29 Jerubeal nwa Joash we je biri n'ulo-ya.