2 Ma ndi Bet-el zigarari Shareza na Regem-melek na ndi-ha ime ka iru Jehova dajua,
3 na igwa ndi-nchu-àjà ndi diri ulo Jehova nke usu nile nke ndi-agha okwu, ha na ndi-amuma, si, M'gākwa ákwá n'ọnwa nke-ise, nēkewaputa onwem, dika m'meworo otutu aro ra ka ndia?
4 Okwu Jehova nke usu nile nke ndi-agha we ruem nti, si,
5 Gwa ndi nile nke ala nka, gwa kwa ndi-nchu-àjà, okwu, si, Mb͕e unu buru ọnu, mb͕e unu tiri aka n'obi n'ọnwa nke-ise, na n'ọnwa nke-asa, ọbuná ọgu arọ atọ na iri ndia, ọ̀ bu obubu-ọnu unu buru ma-ọli nye Mu onwem?
6 Ọzọ, mb͕e unu nēri ihe, ma-ọbu mb͕e unu nāṅu ihe-ọṅuṅu, ọ̀ bughi unu onwe-unu bu ndi nēri ihe? ọ̀ bughi kwa unu onwe-unu bu ndi nāṅu ihe-ọṅuṅu?
7 Ùnu agaghi-anu okwu nile nke Jehova kpọsaworo site n'aka ndi-amuma mbu, mb͕e Jerusalem bu ebe madu bi, mb͕e ọ nọ kwa n'udo, mb͕e madu bi kwa n'obodo-ya nile di ya buruburu na nime Negeb na n'ebe di ala ala?
8 Okwu Jehova we rue Zekaraia nti, si,