11 Ma ihe ndia nēmeri ndi ahu n'uzọ ihe-atù; ewe de ha n'akwukwọ nsọ ka ha we buru ihe idu ayi ọdú, ndi ọgwugwu oge ndia ruteworo.
12 Ya mere, onye nēchè na o nēguzo, ya lezi anya ka ọ ghara ida.
13 Ọ dighi ọnwunwa ọ bula nwaworo unu ma-ọbughi nke madu nānagide: ma Chineke kwesiri ntukwasi-obi, Onye nāgaghi-ekwe ka anwa unu kari nke unu puru inagide; kama n'oge ọnwunwa ahu Ọ gēme kwa uzọ nb͕apu, ka unu we nwe ike inagide ya.
14 N'ihi nka, ndi m'huru n'anya, b͕anarinu ikpere-arusi.
15 Anamekwu dika anamagwa ndi nwere uche; unu onwe-unu tule ihe m'nēkwu.
16 Iko nke ngọzi ahu nke ayi nāgọzi, ọ̀ bughi nnwekọ ọbara Kraist? Achicha ahu nke ayi nānyawa, ọ̀ bughi nnwekọ aru Kraist?
17 n'ihi na otù achicha di, ayi, ọ bu ezie na ayi di ọtutu, ma ayi bu otù aru: n'ihi na ayi nile nēketa òkè n'otù achicha ahu.