24 ma nkpà akpaghi akuku aru nke ayi nke mara nma: kama Chineke tigwara aru n'otù, akuku aru ahu nke nsọpuru fọduru ya inwe ka Ọ nēnyebiga nsọpuru ókè kari;
25 ka nkewa we ghara idi n'aru; kama ka ihe di n'aru we nēcheb͕u onwe-ha nye ibe-ha n'otù uzọ ahu.
26 Ọ buru kwa na otù ihe nke di n'aru nāhu ahuhu, ihe nile di n'aru ahu soro ya nāhukọ ahuhu; ọ buru kwa na anēnye otù ihe di n'aru otuto, ihe nile di n'aru ahu soro ya ṅurikọ ọṅu.
27 Ma unu onwe-unu bu aru nke Kraist, buru kwa ihe di n'aru, onye ọ bula n'akuku nke ya.
28 Chineke debe-kwa-ra ufọdu nime nzukọ-Ya, nke-mbu ndi-ozi, nke-abua ndi-amuma, nke-atọ ndi-ozizí, nke so ha ọlu di ike, nke so ha onyinye-amara di iche iche ime ka aru madu di ike, iye-aka, ichi-isi, aha asusu di iche iche.
29 Ọ̀ gābu na ha nile bu ndi-ozi? ọ̀ gābu na ha nile bu ndi-amuma? ọ̀ gābu na ha nile bu ndi-ozizí? ọ̀ gābu na ha nile bu ndi nālu ọlu di ike?
30 ọ̀ gābu na ha nile nwere onyinye-amara ime ka madu di ike? ọ̀ gābu na ha nile ji asusu di iche iche nēkwu okwu? ọ̀ gābu na ha nile nāsughari asusu?