9 N'ihi na ayi mara na nkpirikpi, ayi nēbu kwa amuma na nkpirikpi:
10 ma mb͕e ọ bula ihe nke zuru okè gābia, agēme ihe, nke di na nkpirikpi ka ọ ghara idi irè.
11 Mb͕e m'buri nwa ọhu, anamekwu dika nwa ọhu, anamatukwasi uche n'ihe dika nwa ọhu, anamagu ihe dika nwa ọhu: ub͕u a mb͕e m'ghọworo okenye, emewom ka omume nwa ọhu ghara idi irè.
12 N'ihi na ub͕u a ayi ji enyo hu ihe, nime ilu; ma mb͕e ahu ayi gāhu iru na iru: ub͕u a m'mara na nkpirikpi; ma mb͕e ahu m'gāmazu dika amazu-kwa-ram.
13 Ma ub͕u a ka okwukwe, olile-anya, ihu-n'anya, ihe atọ ndia, nānọgide; ma nke kachasi n'ihe ndia bu ihu-n'anya.