22 N'ihi na onye akpọrọ nime Onye-nwe-ayi, mb͕e ọ bu orù, ọ bu onye Onye-nwe-ayi mere ka o nwere onwe-ya: otú a onye akpọrọ, mb͕e o nwere onwe-ya, ọ bu orù Kraist.
23 Ewere ọnu-ahia b͕ara unu; unu aghọla ndi-orù madu.
24 Umu-nnam, onye ọ bula, nime ọnọdu nke akpọrọ ya, ya nọgide n'ọnọdu ahu n'ebe Chineke nọ.
25 Ma enweghi m ihe Onye-nwe-ayi nyere n'iwu bayere umu-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke: ma enyem ìzùm, dika onye Onye-nwe-ayi meworo ebere ka m'buru onye kwesiri ntukwasi-obi.
26 Ya mere, anamechè na nka di nma n'ihi nkpà di ub͕u a, bù, na ọ di nma ka madu di otú ọ di.
27 Ékekọwo gi na nwunye? achọla ntọpu. Àtọpuwo gi n'aru nwunye? achọla nwunye.
28 Ma asi kwa na ọ bu ezie na i luru nwunye, i mehieghi; asi kwa na nwa-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke lakuru di, o mehieghi. Otú ọ di, ndi di otú a gēnwe nkpab͕u n'anu-aru-ha: ma mu onwem nēmere unu ebere.