25 Ma enweghi m ihe Onye-nwe-ayi nyere n'iwu bayere umu-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke: ma enyem ìzùm, dika onye Onye-nwe-ayi meworo ebere ka m'buru onye kwesiri ntukwasi-obi.
26 Ya mere, anamechè na nka di nma n'ihi nkpà di ub͕u a, bù, na ọ di nma ka madu di otú ọ di.
27 Ékekọwo gi na nwunye? achọla ntọpu. Àtọpuwo gi n'aru nwunye? achọla nwunye.
28 Ma asi kwa na ọ bu ezie na i luru nwunye, i mehieghi; asi kwa na nwa-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke lakuru di, o mehieghi. Otú ọ di, ndi di otú a gēnwe nkpab͕u n'anu-aru-ha: ma mu onwem nēmere unu ebere.
29 Ma nka ka m'nēkwu, umu-nnam, emewo ka oge a di nkpunkpu, ka ndi nwere nwunye we di ka ha enweghi site n'ub͕u a;
30 ka ndi nākwa ákwá we di ka ha akwaghi; ka ndi nāṅuri ọṅu we di ka ha aṅurighi; ka ndi nāzu ahia we di ka ha enweghi ihe;
31 ka ndi nēji uwa me ihe we di ka ha ejibigaghi ya ókè: n'ihi na uwa nka ka esi ahu ya anya nāgabiga agabiga.