30 ka ndi nākwa ákwá we di ka ha akwaghi; ka ndi nāṅuri ọṅu we di ka ha aṅurighi; ka ndi nāzu ahia we di ka ha enweghi ihe;
31 ka ndi nēji uwa me ihe we di ka ha ejibigaghi ya ókè: n'ihi na uwa nka ka esi ahu ya anya nāgabiga agabiga.
32 Ma anamachọ ka unu buru ndi nādighi-echeb͕u onwe-unu. Onye nēnweghi nwunye nēcheb͕u onwe-ya n'ihe nke Onye-nwe-ayi, otú ọ gēme ihe gātọ Onye-nwe-ayi utọ:
33 ma onye nwere nwunye nēcheb͕u onwe-ya n'ihe uwa, otú ọ gēme ihe gātọ nwunye-ya utọ.
34 Akpawo kwa ókè n'etiti nwunye na nwa-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke. Nwanyi nke nēnweghi di nēcheb͕u onwe-ya n'ihe nke Onye-nwe-ayi, ka o we di nsọ n'aru-ya na mọ-ya kwa: ma nwanyi nke nwere di nēcheb͕u onwe-ya n'ihe nke uwa, otú ọ gēme ihe gātọ di-ya utọ.
35 Ma nka ka m'nēkwu ka ọ bara unu onwe-unu urù; ọ bughi ka m'fekwasi ihe-ntuhi n'aru-unu, kama ka eme ihe kwesiri, ya na ka unu we nọdu n'iru Onye-nwe-ayi ghara inwe uche-nb͕asasi.
36 Ma ọ buru na onye ọ bula nēchè na ọ nēmeso nwa-ya, bú nwa-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke, ihe nādighi nma n'anya, ma asi na ọ gabigawo oge inwe di, asi kwa na ọ di nkpà ime otú a, ya me ihe ọ nāchọ; o mehieghi; ka ha lua di na nwunye.