9 Ma lezienu anya ka ike-unu nka ghara isi n'uzọ ọ bula ghọ ihe gēme ka ndi nādighi ike su ngọngọ.
10 N'ihi na asi na onye ọ bula ahú gi, bú onye nwere ihe-ọmuma, ka i nānọdu na nri nime ulo arusi, akọ-na-uche-ya, ma ọ buru na ọ dighi ike, àgaghi-ewuli ya elu dika ulo iri ihe achuru n'àjà nye arusi?
11 N'ihi na site n'ihe-ọmuma-gi onye ahu nke nādighi ike nāla n'iyì, bú nwa-nna-gi nke Kraist nwuru n'ihi ya.
12 Ma otú a, mb͕e unu nēmehie megide umu-nna-unu, nētib͕u kwa akọ-na-uche-ha mb͕e ọ nādighi ike, unu nēmehie megide Kraist.
13 N'ihi nka, ma ọ buru na ihe-oriri eme ka nwa-nnam ma n'ọnyà, m'gaghi-eri anu ma-ọli rue mb͕e ebighi-ebi, ka m'ghara ime ka nwa-nnam ma n'ọnyà.