25 Ma nne-Ya, na nwa-nne nne-Ya nke nwayi, Meri nwunye Klopas, na Meri Magdalini, nēguzo obe Jisus nso.
26 Ya mere mb͕e Jisus huru nne-Ya, na onye ahu nke nēso uzọ-Ya, onye Ọ huru n'anya, ka o nēguzo nso, Ọ si nne-Ya, Nwanyi, le, nwa-gi nwoke!
27 Mb͕e ahu Ọ si onye ahu nke nēso uzọ-Ya, Le, nne-gi! Site n'oge hour ahu onye ahu nke nēso uzọ-Ya we kuru ya la n'ulo nke aka ya.
28 Mb͕e ihe a gasri, Jisus, ebe Ọ matara na ihe nile agwuwo ub͕u a, ka ihe edeworo n'akwukwọ nsọ we mezu, Ọ si, Akpiri nākpọm nku.
29 Adọbara n'ebe ahu ite nke manya-vine b͕ara uka juru: ya mere ha were sponge nke manya-vine ahu b͕ara uka juru tukwasi n'elu osisi hyssop, che Ya n'ọnu.
30 Ya mere mb͕e Jisus narasiri manya-vine ahu nke b͕ara uka, Ọ siri, Ọ gwuwo O we rube isi, rara mọ-Ya nye.
31 Ya mere ndi-Ju, ebe ọ bu ubọchi Nkwadebe, ka aru-ha we ghara idigide n'elu obe n'ubọchi-izu-ike (n'ihi na ubọchi-izu-ike nke ízù ahu bu oké ubọchi), ha kpere Pailat ka etijie ogwe-ukwu-ha, ka ebupu kwa ha.