20 N'ihi na Nnam nāhu Ọkpara-Ya n'anya, nēgosi kwa Ya ihe nile Ya onwe-ya nēme: oké ọlu kari ndia ka Ọ gēgosi kwa Ya, ka o we ju unu onwe-unu anya.
21 N'ihi na dika Nnam nēme ndi nwuru anwu ka ha si n'ọnwu bilie, dika Ọ nēme kwa ka ha di ndu, otú a ka Ọkpara-Ya nēme kwa ka ndi Ọ nāchọ di ndu.
22 N'ihi na Nnam adighi-ekpe kwa madu ọ bula ikpé, kama O werewo ikpé nile nye Ọkpara-Ya;
23 ka madu nile we sopuru Ọkpara ahu, dika ha nāsọpuru Nna-Ya. Onye nādighi-asọpuru Ọkpara adighi-asọpuru Nna Nke zitere Ya.
24 N'ezie, n'ezie, asim unu, Onye nānu okwum, nke nēkwere kwa Onye ziterem, o nwere ndu ebighi-ebi, ọ biaghi kwa n'ikpé, kama o sitewo n'ọnwu ba na ndu.
25 N'ezie, n'ezie, asim unu, Oge hour nābia, ub͕u a ka ọ di kwa, mb͕e ndi nwuru anwu gānu olu Ọkpara Chineke; ndi nuru gādi kwa ndu.
26 N'ihi na dika Nnam nwere ndu nime Onwe-ya, otú a ka O nye-kwa-ra Ọkpara-Ya inwe ndu nime Onwe-ya: