42 o we welie olu-ya tisie nkpu ike, si, Gi onwe-gi bu onye agọziri agọzi n'etiti ndinyom, ọ bu kwa onye agọziri agọzi ka nkpuru nke afọ-gi di.
43 Òle ebe ka nka si kwa rum, na nne Onye-nwem gābiakutem?
44 N'ihi na lee, mb͕e olu ekele-gi ruru na ntim, nwam wuliri n'afọm n'obi-utọ.
45 Ngọzi nādi-kwa-ra nwanyi ahu nke kwere na ihe ndia gēmezu, bú nke agwaworo ya site n'ọnu Onye-nwe-ayi.
46 Meri we si,Nkpuru-obim nēme ka Onye-nwe-ayi di uku,
47 Ọ nātọ kwa mọm utò nke-uku na Chineke, bú Onye-nzọputam.
48 N'ihi na O lere ọnọdu di ala nke orù-Ya nwanyi anya:N'ihi na le, site n'ub͕u a ọb͕ọ nile gākpọm onye ngọzi diri.