1 N'oge ahu, mb͕e oké ọtutu ìgwè madu anādighi-aguta aguta zukọrọ, nke mere ka ha nāzọkwasi ibe-ha ukwu, O buru uzọ malite isi ndi nēso uzọ-Ya, Nēzenu ihe ndi-Farisi, bú ihe nēko achicha, nke bu iru-abua.
2 Ma ọ dighi ihe ọ bula ekpuchiworo ekpuchi, nke anāgaghi-ekpughe: ọ dighi kwa ihe ezoro ezo, nke anāgaghi-ama.
3 Ya mere ihe ọ bula unu kwuru n'ọchichiri, agānu ya n'ìhè; ihe unu kwu kwa-ra na nti n'ime-ulo ntà, agēkwusa ya n'elu ulo.
4 Ma asim unu ndi-eyim, Unu atula egwu ndi nēb͕u aru, ma emesia ha enweghi ihe ọzọ kari nke ahu ha gēme.
5 Ma M'gēgosi unu Onye unu gātu egwu: tuanu egwu Onye ahu, Nke nwere ike itubà n'ọku ala-mọ mb͕e O b͕usiri; e, asim unu, Tuanu egwu Onye ahu.
6 Àdighi-ere egwele ise na penny abua? ma adighi-echezọ otù nime ha n'iru Chineke.
7 Ma ọbuná agiri-isi nile nke isi-unu ka aguworo. Unu atula egwu: ọnu-ahia-unu kariri nke ọtutu egwele.
8 Ma asim unu, Onye ọ bula nke gēkwuputam n'iru madu, ya ka Nwa nke madu gēkwuputa kwa n'iru ndi-mọ-ozi nke Chineke:
9 ma onye gāgọnarim n'iru madu, agāgọnari ya n'iru ndi-mọ-ozi nke Chineke.
10 Ọzọ, onye ọ bula nke gēkwu okwu megide Nwa nke madu, agāb͕aghara ya: ma agaghi-ab͕aghara onye gēkwulu Mọ Nsọ.
11 Ma mb͕e ọ bula ha kpọrọ unu bia n'iru ulo-nzukọ, na ndi-isi, na ndi nāchi isi, unu echeb͕ula onwe-unu otú unu gāgọpu onwe-unu ma-ọbu ihe unu gēji gọpu onwe-unu, ma-ọbu ihe unu gēkwu:
12 n'ihi na Mọ Nsọ gēzí unu n'oge hour ahu ihe unu nāghaghi ikwu.
13 Ma otù onye sitere n'igwè madu ahu si Ya, Onye-ozizí, gwa nwa-nnem nwoke ka o kère ihe-nketa-ayi nyem.
14 Ma Ọ siri Ya, Nwoke, ònye merem ka M'buru onye-ikpé ma-ọbu onye-òkìkè n'ebe unu nọ?
15 O we si ha, Lezienu anya, debe-kwa-nu onwe-unu ka unu ghara inwe anya-uku ọ bula: n'ihi na ọ bughi n'ihe ọ nwebigara ókè ka ndu madu di, o sighi n'ihe o nwere puta.
16 O we turu ha ilu, si, Ala otù ọgaranya miri nkpuru ri nne:
17 o we tugharia n'obi-ya, si, Gini ka m'gēme, n'ihi na enweghm ebe ikpokọta nkpurum?
18 O we si, Nka ka m'gēme: m'gēweda ọbam, wu kwa nke ka uku; n'ebe ahu ka m'gēkpokọta ọkam nile na ezi ihem nile.
19 M'gāsi kwa nkpuru-obim, Nkpuru-obi, i nwere ọtutu ezi ihe edebere nye gi rue ọtutu arọ; nēzu ike, nēri ihe, nāṅu ihe-ọṅuṅu, ka obi nātọ gi utọ.
20 Ma Chineke siri ya, Onye nēnweghi uche, n'abali a ka anāchọ mkpure-obi-gi n'aka-gi; ma ihe i doziri, ònye gēnwe ha?
21 Otú a ka ọ di, bú onye nākpadoro onwe-ya àkù, ma ọ bughi ọgaranya n'ebe Chineke nọ.
22 Ọ we si ndi nēso uzọ-Ya, N'ihi nka ka M'ji si unu, Unu echeb͕ula onwe-unu nye ndu-unu, ihe unu gēri; echeb͕u-kwa-la onwe-unu nye aru-unu, ihe unu gēyi.
23 N'ihi na ndu kariri ihe eji azù ya, aru kari-kwa-ra uwe-oyiyi-ya.
24 Tugharinu uche n'ugolo-ọma, na ha adighi-agha nkpuru, ha adighi-ewe kwa ihe ubi; nke nēnweghi ime-ulo ntà ma-ọbu ọba; ma Chineke nāzù ha: ùnu onwe-unu abughi ihe oké ọnu-ahia kari anu-ufe nke-uku?
25 Ma ònye n'etiti unu puru itukwasi otù cubit n'ogologo-ya site n'icheb͕u onwe-ya?
26 Ya mere ọ buru na unu apughi ime ọbuná nke dikarisiri ntà, gini mere unu nēcheb͕u onwe-unu n'ihe fọduru?
27 Tugharinu uche n'ahihia nke ọhia, otú ha nētó etó: ha adọb͕ughi onwe-ha n'ọlu, ha atughi kwa ogho; ma asim unu, Ọbuná Solomom n'ebube-ya nile, eb͕okwasighi ya ákwà dika otù nime ndia.
28 Ma ọ buru na Chineke eyikwasi ahihia di n'ubi uwe otú a, nke di ta, echi atubà ya n'ite ọku; Ọ̀ gaghi-eyikwasi kari unu uwe nke-uku, unu ndi okwukwe ntà?
29 Unu onwe-unu achọ-kwa-la ihe unu gēri, na ihe unu gāṅu, unu enwe-kwa-la obi abua.
30 N'ihi na ihe ndia nile ka mba nile nke uwa nāchọ: ma Nna-unu nāmata na ihe ndia di unu nkpà.
31 Otú ọ di, chọnu ala-eze-Ya, agātukwasi-kwa-ra unu ihe ndia.
32 Atula egwu, ìgwè aturu ntà; n'ihi na ọ di Nna-unu ezi nma inye unu ala-eze-Ya.
33 Renu ihe unu nwere, were ha lua ọlu ebere; merenu onwe-unu àkpà-ego nke nādighi-aka nká, àkù nādighi-agwu agwu n'elu-igwe, ebe onye-ori nādighi-abia nso, ebe nla nādighi-emebi kwa ihe.
34 N'ihi na ebe àkù-unu di, n'ebe ahu ka obi-unu gādi kwa.
35 Ka eke unu ihe-ọkiké n'úkwù, ka oriọna-unu nēnwu kwa;
36 unu onwe-unu, yikwara ndi nēche onye-nwe-ha, mb͕e ọ gēsi n'oriri ọlulu-nwunye laghachi; ka, mb͕e ọ gābia ku aka n'ọnu-uzọ, ka ha we meghere ya ngwa ngwa.
37 Ngọzi nādiri ndi-orù ahu, ndi, mb͕e onye-nwe-ha gābia, ọ gāhu ka ha nēche nche: n'ezie asim unu, na ọ gēke onwe-ya ihe-ọkiké n'úkwù, me ka ha nọdu na nri, ọ gābia kwa jere ha ozi.
38 Ọ buru kwa na ọ gābia na nche nke-abua, ọ buru kwa na nke-atọ, hu kwa ha otú a, ngọzi nādiri ndi-orù ahu.
39 Ma unu mara nka, na ọ buru na nna-nwe-ulo matarari oge hour onye-ori gābia, ọ ganēche nche, ọ gaghi-arapu kwa ulo-ya ka egwupú ya.
40 Unu onwe-unu buru kwa ndi edoziworo: n'ihi na n'oge hour nke unu nēchèghi ka Nwa nke madu gābia.
41 Pita we si, Onye-nwe-ayi, Ọ̀ bu ayi ka I nāturu ilu a, ma-ọbu madu nile kwa?
42 Onye-nwe-ayi we si, Ònye kwa bu onye ahu nāchi èzí-na-ulo, onye kwesiri ka atukwasi ya obi, nke nwe-kwa-ra uche, nke onye-nwe-ya gēme onye-isi èzí-na-ulo-ya, inye ha òkè nri ha n'oge-ya?
43 Ngọzi nādiri orù ahu, onye, mb͕e onye-nwe-ya gābia, ọ gāhu ya ka ọ nēme otú a.
44 N'ezie asim unu, na ọ gēme ya onye-isi ihe nile o nwere.
45 Ma ọ buru na orù ahu gāsi n'obi-ya, Onye-nwem nānọ ọdù di anya ibia; ọ buru kwa na ọ gāmalite iti ndikom na ndinyom nēje ozi aka, na iri ihe-oriri na iṅu ihe-ọṅuṅu, na iṅubiga manya ókè;
46 onye-nwe orù ahu gābia n'ubọchi ọ nēleghi anya ya, na n'oge hour ọ nāmaghi, ọ gēb͕ubi kwa ya nkpirikpi abua, ke òkè nye ya n'etiti ndi nēkwesighi ka atukwasi ha obi.
47 Ọzọ, orù ahu, nke mara ihe onye-nwe-ya chọrọ, ma o dozighi, o meghi kwa dika ọ chọrọ, agāpia ya ọtutu utari;
48 ma onye nāmaghi, me kwa ihe kwesiri ihe-otiti, agāpia ya utari ole-na-ole. Ọzọ, onye ọ bula enyere ihe uku, n'aka-ya ka agāchọ kwa ihe uku: onye ha nye-kwa-ra ihe uku n'aka idebe, n'aka-ya ka ha gāju ihe nke ka.
49 Abiaram itusa ọku n'elu uwa; ma gini ka M'nāchọ, ọ buru na afunwuwo ya-ri ub͕u a?
50 Ma enwerem baptism agēji mem baptism; ọ nēb͕ukwam nb͕u n'obi nke-uku rue mb͕e agēmezu ya.
51 Ùnu nēchè na abiaram inye udo n'uwa? asim unu, É-è; kama nkewa:
52 n'ihi na site n'ub͕u a madu ise ndi kewaworo ekewa gādi n'otù ulo, madu atọ megide madu abua, madu abua megide kwa madu atọ.
53 Agēkewa ha, nna megide nwa-ya nwoke, nwa-nwoke megide kwa nna-ya; nne megide nwa-ya nwanyi, nwa-nwanyi megide kwa nne-ya; nne di megide nwunye nwa-ya, nwunye nwa megide kwa nne di-ya.
54 O we si kwa ìgwè madu nile, Mb͕e ọ bula unu huru igwe-oji ka o si n'Ọdida-anyanwu nārigo, ngwa ngwa unu nāsi, Nshansha-miri nābia; o were mee otua.
55 Mb͕e ọ bula unu hukwara ifufe Ndida ka ọ nēfe, unu nāsi, Ifufe di ọku gādi; o we me.
56 Ndi-iru-abua, unu matara itule iru ala na elu-igwe; ma òle ka o si di na unu amataghi itule oge a?
57 Ma gini mere unu adighi-ekpe n'onwe-unu ihe ziri ezi?
58 N'ihi na mb͕e gi na onye nēkuru gi ga ikpé nāga n'iru onye-isi, mesie ike ipu n'aka-ya n'uzo; ka ọ ghara idọkpuru gi nye onye-ikpé ma eleghi anya, onye-ikpé gārara kwa gi nye n'aka onye nēnye ndi-nmehie ahuhu, onye ahu nēnye ndi nmehie ahuhu gātubà kwa gi n'ulo-nkpọrọ
59 Asim i, I gaghi-aputa n'ebe ahu ma-ọli, rue mb͕e i gākwughachi ọbuná ego ntà ikpe-azu.