Luk 20 IGBOB

1 O we rue, n'otù nime ubọchi ahu, mb͕e Ọ nēzí ndi-Ju ihe n'ulo uku Chineke, nēzì kwa ozi ọma, na ndi-isi-nchu-àjà na ndi-ode-akwukwọ, ha na ndi-okenye, we guzo Ya nso;

2 ha we kwue, si Ya, Gwa ayi: Ọ̀ bu n'aha ike gini ka I nēme ihe ndia? ma-ọbu ònye ka ọ bu, bú onye nyere Gi ike a?

3 Ma Ọ zara, si ha, Mu onwem gāju kwa unu otù ajuju unu zakwam:

4 Baptism nke Jọn, ò sitere n'elu-igwe, ma-ọbu na o sitere n'aka madu?

5 Ha we kwurita n'etiti onwe-ha, si, Ọ buru na ayi asi, O sitere n'elu-igwe; Ọ gāsi, N'ìhi gini ka unu nējighi kwe ya?

6 Ma ọ buru na ayi asi, O sitere n'aka madu; ndi-Ju nile gēji nkume tub͕u ayi: n'ihi na emewo ka ha kweye na Jọn bu onye-amuma.

7 Ha we za, si na ha amataghi ebe o sitere.

8 Jisus we si ha, Mu onwem agaghi-agwa kwa unu aha ike M'ji eme ihe ndia.

9 O we malite ituru ndi-Ju ilu a: Otù onye kuru ubi-vini, were kwa ya tiye n'aka ndi-ọlu-ubi, we je ala ọzọ nọdu oge di anya.

10 N'oge ighọ nkpuru o we zigara ndi-ọlu-ubi ahu otù orù, ka ha we nye ya nkpuru ufọdu nke ubi-vine ahu: ma ndi-ọlu-ubi ahu piara ya ihe, zilaga ya n'aka efu.

11 O we zikwasi orù ọzọ: ha we pia kwa ya ihe, me ya ihe-ihere, zilaga ya n'aka efu.

12 O we zikwasi orù nke-atọ: ha we meru kwa onye ahu aru, we tupu ya.

13 Onye-nwe ubi-vine ahu we si, Gini ka m'gēme? m'gēziga ọkparam m'huru n'anya: eleghi anya ha gāsọpuru nwam nka.

14 Ma mb͕e ndi-ọlu-ubi ahu huru ya, ha kwurita n'etiti onwe-ha, si, Nka bu onye-nketa: ka ayi b͕ue ya, ka ihe-nketa-ya we buru nke ayi.

15 Ha we tupu ya n'azu ubi-vine ahu, b͕ue ya. Gini kwa ka onye-nwe ubi-vine ahu gēme ha?

16 Ọ gābia, la ndi-ọlu-ubi ahu n'iyì, were kwa ubi-vine ahu nye ndi ọzọ. Ma mb͕e ha nuru ya, ha si, Chineke ekwela.

17 Ma O lere ha anya, si, Gini kwa bu ihe a nke edeworo n'akwukwọ nsọ,Nkume nke ndi nēwu ulo juru,Nke ahu ka emere isi nkuku ulo?

18 Agētiwasi onye ọ bula nke dakwasiri nkume ahu; ma onye ọ bula ọ gādakwasi ya, ọ gēfesa ya ka uzuzu.

19 Ndi-ode-akwukwọ na ndi-isi-nchu-àjà we chọ uzọ itukwasi Ya aka n'otù oge hour ahu; ma ha turu egwu ndi-Ju: n'ihi na ha mara na Ọ turu ilu a imegide ha.

20 Ha we che Ya nche, we zipu ndi-nledo, ndi mere onwe-ha dika ndi ezi omume, ka ha we jide Ya n'okwu-ọnu-Ya, irara Ya nye n'aka ọchichi na ike nke onye-isi.

21 Ha we jua Ya, si, Onye-ozizí, ayi amatawo na I nēkwu nēzi kwa ihe ziri ezi, na I dighi-ele kwa madu anya n'iru, kama I nēzí uzọ Chineke n'ezi-okwu:

22 Ò ziri ezi n'iwu ka ayi tu ùtú nye Sisa, ma-ọbu na ò zighi ezi?

23 Ma Ọ matara aghughọ-ha, we si ha,

24 Gosinum otù shilling. Ònyinyo na ihe-ndekwasi nke onye ka o nwere? Ha si, Nke Sisa.

25 O we si ha, Ya mere, nyeghachinu Sisa ihe nke Sisa, nyeghachi-kwa-nu Chineke ihe nke Chineke.

26 Ha enweghi kwa ike ijide okwu-Ya n'iru ndi-Ju: ọziza-Ya we ju ha anya, ha we kpuchie ọnu-ha.

27 Ufọdu n'etiti ndi-Sadusi, ndi si na nbilite-n'ọnwu adighi, we biakute Ya; ha we jua Ya,

28 si, Onye-ozizí, Moses dere akwukwọ nye ayi, si, na ọ buru na nwa-nne-nwoke onye ọ bula anwua, mb͕e o nwere nwunye, ma onye ahu enweghi nwa, ka nwa-nne-ya nwoke kuru nwunye-ya, me ka nkpuru toputara nwa-nne-ya.

29 Ya mere, umu-nne-ndikom asa di: nke-mbu luru nwunye, we nwua nēnweghi nwa;

30 nke-abua kwa;

31 nke-atọ we kuru ya; otú ahu ha asa arapughi umu, we nwua.

32 Mb͕e ha nile nwusiri nwanyi ahu nwukwara.

33 Ya mere, na nbilite-n'ọnwu nwùnye onye n'etiti ha ka ọ gābu? n'ihi na ha asa nwere ya na nwunye.

34 Jisus we si ha, Umu nke oge a nālu nwunye, anēnye kwa ha n'ọlulu-di:

35 ma ndi aguru na ha kwesiri iru oge ahu, na iru nbilite-n'ọnwu ahu, bú isi na ndi nwuru anwu bilie, ha alughi nwunye, enyeghi kwa ha n'ọlulu-di:

36 n'ihi na ha apughi kwa inwu ọzọ: n'ihi na ha na ndi-mọ-ozi ra; ha bu kwa umu Chineke, ebe ha bu umu nbilite-n'ọnwu ahu.

37 Ma ọbuná Moses gosiri na anēme ka ndi nwuru anwu si n'ọnwu bilie, nēkwu nime ebe edere okwu bayere Osisi ntà, mb͕e ọ nākpọ Onye-nwe-ayi Chineke nke Abraham, na Chineke nke Aisak, na Chineke nke Jekob.

38 Ma Ọ bughi Chineke nke ndi nwuru anwu, kama Ọ bu nke ndi di ndu: n'ihi na ọ bu n'ebe Ọ nọ ka madu nile di ndu.

39 Ufọdu n'etiti ndi-ode-akwukwọ we za, si, Onye-ozizí, I kwuru nke-ọma.

40 N'ihi na ha enweghi anya-ike ọzọ iju Ya ajuju ọ bula.

41 O we si ha, Hà si aṅa kwu na Kraist ahu bu nwa Devid?

42 N'ihi na Devid onwe-ya nēkwu n'akwukwọ Abù ọma, si,Onye-nwe-ayi siri Onye-nwem,Nọdu ala n'aka-nrim,

43 Rue mb͕e M'gēdo ndi-iro-Gi ka ihe-nb͕akwasi-ukwu nke ukwu-Gi abua.

44 Ya mere, Devid nākpọ Ya Onye-nwe-ya, Ò si kwa aṅa buru Nwa-ya?

45 Ma mb͕e ndi-Ju nile nānu okwu-Ya Ọ si ndi nēso uzọ-Ya,

46 Nēzenu ndi-ode-akwukwọ, ndi nāchọ ijeghari n'uwe-nwuda, ndi nāhu kwa ekele n'ọma-ahia nile unu n'anya, na isi oche nile n'ulo-nzukọ nile unu, na isi ọnọdu n'oriri nile unu;

47 ndi nēripia ulo ndinyom di-ha nwuru, ndi nēkpe kwa ogologo ekpere ka madu we hu ha anya: ndia gēnwe ezi ọmuma-ikpé gabigara ókè kari ndi ọzọ.

isiakwụkwọ

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14 15 16 17 18 19 20 21 22 23 24