Luk 3 IGBOB

1 Ma n'arọ nke-iri-na-ise n'ọchichi nke Taibiriọs Sisa, mb͕e Pọntiọs Pailat bu onye nāchi Judia, mb͕e Herod bu kwa tetrarch nke Galili, mb͕e nwa-nne-ya Filip bu kwa tetrarch nke ala Ituria na Trakonaitis, mb͕e Lisanias bu kwa tetrarch nke Abilini,

2 mb͕e Anas na Kaiafas bu ndi-isi-nchu-àjà, okwu Chineke biakutere Jọn nwa Zakaraias n'ọhia.

3 O we bia n'ala nile di Jọ̀dan gburugburu, nēkwusa baptism nke nchèghari, ka ewe b͕aghara nmehie;

4 dika edeworo ya n'akwukwọ okwu Aisaia onye-amuma, si,Olu otù onye nēti nkpu n'ọhia, si,Dozienu uzọ Onye-nwe-ayi,Menu okporo-uzọ-Ya ka ha guzozie.

5 Agēkpoju ndagwurugwu ọ bula,Agēme kwa ka ugwu ọ bula na ugwu ntà ọ bula di ala;Ebe di nb͕agọ gāghọ kwa ebe guzoziri eguzozi,Ebe nile di nkputankpu gābu kwa uzọ di lari;

6 Madu nile gāhu kwa nzọputa Chineke.

7 Ya mere ọ si ìgwè madu ahu ndi biara ka ọ me ha baptism, Unu umu nke aju-ala, ònye gosiri unu ka unu b͕anari iwe gaje ibia?

8 Ya mere mianu nkpuru kwesiri nchèghari-unu, unu amalite-kwa-la ikwu nime onwe-unu, si, Ayi nwere Abraham na nna: n'ihi na asim unu, na Chineke puru ime ka umu tolitere Abraham site na nkume ndia.

9 Ma ọbuná ub͕u a anātukwasi kwa anyu-ike na nkpọrọgwu osisi nile; ya mere anēb͕utu osisi ọ bula nke nāmighi nkpuru ọma, tubà kwa ya nime ọku.

10 Ìgwè madu ahu we jua ya, si, Ọ̀ bu kwa gini kwesiri ka ayi me?

11 O we za, si ha, Onye nwere uwe-ime abua, ya me onye nēnweghi ka o keta; onye nwekwara nri, ya mee otú ahu.

12 Ndi-ọna-utu biakwara ka eme ha baptism, ha we si ya, Onye-ozizí, gini kwesiri ka ayi me?

13 Ọ si ha, Unu apunarala madu kari ihe akaworo unu.

14 Ndi-agha nēje ozi jukwara ya, si, Ayi onwe-ayi kwa, gini kwesiri ka ayi me? Ọ si ha, Unu ejidela onye ọ bula aka ike, ebokwala onye ọ bula ebubo ugha; ka afọ ju kwa unu n'ego-ọlu-unu.

15 Mb͕e ndi-Ju nọ nēle anya, mb͕e madu nile nātughari kwa n'obi-ha ihe bayere Jọn, ma eleghi anya ya onwe-ya bu Kraist ahu,

16 Jọn zara, si ha nile, Mu onwem nēji miri me unu baptism n'ezie; ma Onye kam ike nābia, Onye m'nērughi itọpu eriri akpukpọ-ukwu-Ya: Onye ahu gēji Mọ Nsọ na ọku me unu baptism:

17 Onye ihe-ifucha-ọka-Ya di n'aka-Ya, ifuchapu ebe-nzọcha-ọka-Ya nke-ọma, na ikpokọta ọka-Ya n'ọba-Ya; ma Ọ gēji ọku anāpughi imenyu emenyu rechapu ib͕ob͕o.

18 Ya mere o ji ọtutu ndumọdu di iche iche zì ndi-Ju ozi ọma;

19 ma Herod, bú tetrarch, ebe Jọn turu ya nmehie-ya n'anya, bú ihe bayere Herodias nwunye nwa-nna-ya, na ihe bayere ajọ ihe nile Herod mere,

20 ọ tukwasi-kwara nka n'elu ihe nile, na o mechibidoro Jọn n'ulo-nkpọrọ.

21 Ma mb͕e emere ndi-Ju nile baptism, o rue, mb͕e emesikwara Jisus baptism, mb͕e Ọ nēkpe kwa ekpere, na emeghere elu-igwe,

22 Mọ Nsọ we fedakwasi Ya n'oyiyi aru, dika nduru, olu we site n'elu-igwe, si, Gi onwe-gi bu Ọkparam M'huru n'anya; ihe-Gi dim ezi mma.

23 Ma Jisus onwe-ya, mb͕e Ọ malitere izí ihe, Ọ b͕ara ihe dika orú arọ na iri, buru Nwa Josef (dika echère), nwa Hili,

24 nwa Matat, nwa Livai, nwa Melkai, nwa Janai, nwa Josef,

25 nwa Matataias, nwa Emos, nwa Nehum, nwa Esli, nwa Nagai,

26 nwa Meath, nwa Matataias, nwa Semein, nwa Josek, nwa Joda,

27 nwa Joanan, nwa Risa, nwa Zerubabel, nwa Shealtiel, nwa Nirai,

28 nwa Melkai, nwa Adai, nwa Kosam, nwa Elmadam, nwa Ia,

29 nwa Jisus, nwa Elieza, nwa Jorim, nwa Matat, nwa Livai,

30 nwa Simeon, nwa Judas, nwa Josef, nwa Jonam, nwa Elaiakim,

31 nwa Melea, nwa Mena, nwa Matata, nwa Netan, nwa Devid,

32 nwa Jesi, nwa Obed, nwa Boaz, nwa Salmon, nwa Nahshon,

33 nwa Aminadab, nwa Admin, nwa Anai, nwa Hezron, nwa Perez, nwa Juda,

34 nwa Jekob, nwa Aisak, nwa Abraham, nwa Tira, nwa Nehoa,

35 nwa Serug, nwa Reu, nwa Peleg, nwa Iba, nwa Shela,

36 nwa Kainan, nwa Afaksad, nwa Shem, nwa Noa, nwa Lemek,

37 nwa Metusela, nwa Inok, nwa Jered, nwa Mahalaleel, nwa Kenan,

38 nwa Enos, nwa Set, nwa Adam, nwa Chineke.

isiakwụkwọ

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14 15 16 17 18 19 20 21 22 23 24