52 O wedawo ndi di ike pua n'oche-eze-ha,Weli kwa elu ndi ọnọdu-ha di ala.
53 O werewo ezi ihe nile nyeju ndi agu nāgu afọ;Zipu kwa ndi-ọgaranya n'aka efu.
54 O nyeworo Israel nwa-Ya aka,Ka O we cheta ebere
55 (Dika Ọ gwara nna-ayi-hà)N'ebe Abraham na nkpuru-ya nọ rue mb͕e ebighi-ebi.
56 Meri we nọyere ya ihe dika ọnwa atọ, we laghachi n'ulo-ya.
57 Ma oge Elizabet zuru ka ọ gāmuta nwa; o we mua nwa-nwoke.
58 Ndi-ab͕ata-obi-ya na ndi-ikwu-ya we nu na Onye-nwe-ayi mere ka ebere-Ya di uku n'ebe ọ nọ; ha we so ya ṅuri ọṅu.