12 Asim unu, Ala Sọdọm gānagide okwu n'ubọchi ahu kari obodo ahu.
13 Ahuhu gādiri gi, Korazin; ahuhu gādiri gi, Betsaida; n'ihi na asi na alururi ọlu nile di ike na Taia na Saidon, nke aluru nime unu, ha gēchèghariwori n'oge di anya gara aga, nānọdu n'ákwà-nkpe na ntu.
14 Otú ọ di, Taia na Saidon gānagide okwu n'ikpé ahu kari unu.
15 Gi onwe-gi kwa, Kapanaum, àgēweli gi rue elu-igwe? agēweda gi rue Hedis.
16 Onye nānu okwu-unu nānu okwu Mu onwem; onye nāju kwa unu nāju Mu onwem; ma onye nāju Mu onwem nāju Onye ziterem.
17 Ọgu ndikom atọ na iri ahu were ọṅù lata, si, Onye-nwe-ayi, ọbuná ndi-mọ ọjọ ka anēdo n'okpuru ayi n'aha-Gi.
18 O we si ha, Ahurum Setan ka ọ darari dika àmùmà pua n'elu-igwe.