42 Ma ahuhu gādiri unu ndi-Farisi; n'ihi na unu nēnye otù uzọ n'uzọ iri nke nkpa-akwukwọ nēsi ísì utọ na rue na nkpa-akwukwọ nile, ma unu nagabiga ikpé na ihu-n'anya Chineke: ma ọ di nkpà ka unu me ihe ndia, ka unu ghara kwa irapu ihe ahu.
43 Ahuhu gādiri unu ndi-Farisi; n'ihi na unu nāhu isi oche nile n'ulo-nzukọ nile, na ekele n'ọma-ahia nile, n'anya.
44 Ahuhu gādiri unu; n'ihi na unu di ka ílì nke nāputaghi ìhè, nke madu ndi nējeghari n'elu ha nāmataghi ya.
45 Ma otù onye nime ndi-iwu zara, si Ya, Onye-ozizí, n'ikwu okwu a I nēme kwa ayi ihe-ihere.
46 O we si, Ahuhu gādi-kwa-ra unu ndi-iwu; n'ihi na unu nēbo madu ibu di ike obubu, ma unu onwe-unu ejighi otù nime nkpisi-aka-unu kpatu ibu ahu.
47 Ahuhu gādiri unu; n'ihi na unu nēwu ebe anēlì ndi-amuma, ma nna-unu-hà b͕uru ha.
48 Ya mere unu bu ndi-àmà, ọlu nna-unu-hà di kwa unu ezi nma: n'ihi na ha onwe-ha b͕uru ha, ma unu onwe-unu nēwu ebe anēlì ha.