38 Ọ buru kwa na ọ gābia na nche nke-abua, ọ buru kwa na nke-atọ, hu kwa ha otú a, ngọzi nādiri ndi-orù ahu.
39 Ma unu mara nka, na ọ buru na nna-nwe-ulo matarari oge hour onye-ori gābia, ọ ganēche nche, ọ gaghi-arapu kwa ulo-ya ka egwupú ya.
40 Unu onwe-unu buru kwa ndi edoziworo: n'ihi na n'oge hour nke unu nēchèghi ka Nwa nke madu gābia.
41 Pita we si, Onye-nwe-ayi, Ọ̀ bu ayi ka I nāturu ilu a, ma-ọbu madu nile kwa?
42 Onye-nwe-ayi we si, Ònye kwa bu onye ahu nāchi èzí-na-ulo, onye kwesiri ka atukwasi ya obi, nke nwe-kwa-ra uche, nke onye-nwe-ya gēme onye-isi èzí-na-ulo-ya, inye ha òkè nri ha n'oge-ya?
43 Ngọzi nādiri orù ahu, onye, mb͕e onye-nwe-ya gābia, ọ gāhu ya ka ọ nēme otú a.
44 N'ezie asim unu, na ọ gēme ya onye-isi ihe nile o nwere.