15 Ma otù onye n'etiti ha, mb͕e ọ huru na emere ka aru di ya ike, ọ laghachi, were oké olu nenye Chineke otuto;
16 o we da kpuchie iru-ya n'ala n'ukwu-Ya, nēkele Ya: onye ahu bu kwa onye Sameria.
17 Ma Jisus zara, si, Èmeghi ka aru ndikom iri ahu di ọcha? ma òle ebe iteghete fọduru no?
18 Àhughi ndi laghachiri inye Chineke otuto, ma-ọbughi onye ala ọzọ a?
19 O we si ya, Bilie, ga nke gi: okwukwe-gi azọputawo gi.
20 Ma mb͕e ndi-Farisi juru Ya mb͕e ala-eze Chineke gābia, Ọ zara ha, si, Ala-eze Chineke adighi-abia mb͕e madu nēche nche:
21 ha agaghi-asi kwa, Le, n'ebe a! ma-ọbu, N'ebe ahu! n'ihi na le, ala-eze Chineke di n'etiti unu.