30 n'otù aka ahu ka ọ gādi n'ubọchi agēkpughe Nwa nke madu.
31 N'ubọchi ahu, onye gānọ n'elu ulo, ma ihe-ya di nime ulo, ya ghara iridata ikwapu ha: otú ahu onye nọ kwa n'ubi, ya ghara ilaghachi.
32 Chetanu nwunye Lot.
33 Onye ọ bula nke gāchọ uzọ izutara onwe-ya ndu-ya, o gētufu ya: ma onye ọ bula nke gētufu ndu-ya gēme ya ka ọ di ndu.
34 Asim unu, N'abali ahu madu abua gādi n'elu otù ihe-ndina; agēwere otù nime ha, rapu ibe-ya.
35 Ndinyom abua ganēgwekọ nri n'otù ebe; agēwere otù nime ha, ma agārapu ibe-ya.
36 Madu abua gāno kwa n'ubi; agēwere otù rapu kwa ibe-ya.