34 Ma ndi ahu aghọtaghi ihe ọ bula n'ihe ndia; ezonari-kwa-ra ha okwu a, ha amaghi kwa ihe anēkwu.
35 O rue, mb͕e Ọ nābiaru Jeriko nso, otù onye-ìsì nānọdu n'akuku uzọ nāriọ aririọ:
36 ma ebe ọ nuru ùzù ìgwè madu ka ha nāgabiga, ọ jua isi ihe a.
37 Ha we kọrọ ya, na Jisus Onye Na-zaret nāgabiga.
38 O we tie nkpu, si, Jisus, Nwa Devid, merem ebere.
39 Ndi bu uzọ ga we bara ya nba, ka o kpuchie ọnu-ya: ma onye ahu tikariri nkpu nke-uku, si, Nwa Devid, merem ebere.
40 Jisus we guzo, si ka eduru ya biakute Ya: ma mb͕e ọ biara nso, Ọ jua ya, si,