26 Mọ Nsọ duru ya-ri ọdu, na ọ gaghi-ahu ọnwu, rue mb͕e ọ gāhu Kraist nke Onye-nwe-ayi.
27 O we bia na Mọ ahu nime ulo uku Chineke: mb͕e ndi muru Ya kubatara Nwatakiri ahu, bú Jisus, ka ha we mere Ya dika omume iwu Chineke si di,
28 ya onwe-ya we nara Ya nke-ọma, kuru Ya n'aka-ya, gọzi kwa Chineke, si,
29 Onye-nwem, ub͕u a ka I gārapu orù-Gi ka ọ laN'udo, dika okwu-Gi si di;
30 N'ihi na anyam ahuwo nzọputa-Gi,
31 Nke I doziri n'iru ndi nile;
32 Ìhè agēkpughere mba nile ọzọ,Na ebube ndi-Gi, bú Israel.