29 Onye-nwem, ub͕u a ka I gārapu orù-Gi ka ọ laN'udo, dika okwu-Gi si di;
30 N'ihi na anyam ahuwo nzọputa-Gi,
31 Nke I doziri n'iru ndi nile;
32 Ìhè agēkpughere mba nile ọzọ,Na ebube ndi-Gi, bú Israel.
33 Ihe ekwuru bayere Ya we nēju kwa nna-Ya na nne-Ya anya;
34 Simeon we gọzie ha, si kwa Meri nne-Ya, Le, edowo Nwa nka ka Ọ buru ọdida na nbili nke ọtutu madu n'Israel; ka Ọ buru kwa ihe-iriba-ama anēkwu okwu megide;
35 ma mma-agha gāduwa kwa nkpuru-obi gi onwe-gi; ka ewe kpughe èchìchè nke si n'ọtutu obi puta.