30 N'ihi na anyam ahuwo nzọputa-Gi,
31 Nke I doziri n'iru ndi nile;
32 Ìhè agēkpughere mba nile ọzọ,Na ebube ndi-Gi, bú Israel.
33 Ihe ekwuru bayere Ya we nēju kwa nna-Ya na nne-Ya anya;
34 Simeon we gọzie ha, si kwa Meri nne-Ya, Le, edowo Nwa nka ka Ọ buru ọdida na nbili nke ọtutu madu n'Israel; ka Ọ buru kwa ihe-iriba-ama anēkwu okwu megide;
35 ma mma-agha gāduwa kwa nkpuru-obi gi onwe-gi; ka ewe kpughe èchìchè nke si n'ọtutu obi puta.
36 Otù onye anākpọ Ana di kwa, bú onye-amuma-nwanyi, nwa-nwanyi Fanuel, nke si n'ebo Asha puta (nwanyi a aghọwo ezi agadi, ebe ya na di-ya biri arọ asa site na nwa-ab͕ọghọ-ya,