6 O we rue, mb͕e ha nọ n'ebe ahu, ubọchi-ya zuru ka ọ gāmuta nwa.
7 O we muta Nwa-nwoke mbu ya; o we ke Ya n'ákwà ọkiké, nyibe Ya n'ihe anētiye nri anu-ulo, n'ihi na uzọ adighi nye ha n'ulo ndi-ije.
8 Ndi-ọzùzù-aturu di n'otù ala ahu nānọ n'ọhia, nēche kwa ìgwè aturu-ha n'abali.
9 Mọ-ozi nke Onye-nwe-ayi we guzo ha nso, ebube nke Onye-nwe-ayi muba-kwa-ra ha gburugburu: ha we tua egwu nke-uku.
10 Mọ-ozi ahu we si ha, Unu atula egwu; n'ihi na le, anamezì unu ozi ọma nke oké ọṅù nke gādiri ndi Israel nile:
11 n'ihi na ta n'obodo Devid ka amuru nye unu Onye-nzọputa, Nke bu Kraist Onye-nwe-ayi.
12 Nka gābu-kwa-ra unu ihe-iriba-ama-Ya; Unu gāhu Nwa ọhu ekere n'ákwà ọkiké, nēdina kwa n'ihe anētiye nri anu-ulo.