10 Ọ si ha, Le, mb͕e unu batasiri nime obodo a, otù nwoke nke bū ite miri gēzute unu; sonu ya ba n'ulo nke ọ nābà nime ya.
11 Unu gāsi kwa nna-nwe ulo ahu, Onye-ozizí si gi, Òle ebe ulo-ọbìa di, ebe Mu na ndi nēso uzọm gēri oriri ngabiga?
12 Onye ahu gēgosi kwa unu ime-ulo uku di n'elu ulo akwadebeworo: dozienu n'ebe ahu.
13 Ha we je, hu dika Ọ gwara ha-ri: ha we dozie ememe ngabiga.
14 Mb͕e oge hour ahu ruru, O we nọdu na nri, Ya na ndi-ozi-Ya.
15 O we si ha, Agu gusirim ike iso unu ri oriri ngabiga nka mb͕e Mu akāhughi ahuhu:
16 n'ihi na asim unu, M'gaghi-eri ya ma-ọli, rue mb͕e ọ gēmezu n'ala-eze Chineke.