13 Ha we je, hu dika Ọ gwara ha-ri: ha we dozie ememe ngabiga.
14 Mb͕e oge hour ahu ruru, O we nọdu na nri, Ya na ndi-ozi-Ya.
15 O we si ha, Agu gusirim ike iso unu ri oriri ngabiga nka mb͕e Mu akāhughi ahuhu:
16 n'ihi na asim unu, M'gaghi-eri ya ma-ọli, rue mb͕e ọ gēmezu n'ala-eze Chineke.
17 O we nara iko, kele kwa, we si, Naranu nka, kè kwa ya n'etiti onwe-unu:
18 n'ihi na asim unu, M'gaghi-aṅu ihe si n'osisi vine puta ma-ọli site ugbu a, rue mb͕e ala-eze Chineke gābia.
19 O we nara ob͕e achicha, kele kwa, we nyawa ya, nye ha, si, Nka bu arum nke anēnye n'ihi unu: nēmenu nka ka anu we nēchetam.