20 Mb͕e ha risiri nri-anyasi Ọ nara kwa iko otú ahu, si, Iko a bu ọb͕ub͕a-ndu ọhu nime ọbaram, bú nke anāwusi n'ihi unu.
21 Ma le, aka onye nāraram nye diyerem n'elu table.
22 N'ihi na Nwa nke madu nāga n'ezie, dika akaworo ya: ma ahuhu gādiri nwoke ahu onye anēsite n'aka-ya rara Ya nye.
23 Ha we malite ijurita onwe-ha, onye ọ bu n'etiti ha gēme ihe a.
24 Esem-okwu we da kwa n'etiti ha, onye nime ha ka anāgu na ọ ka ibe-ya uku.
25 O we si ha, Ndi-eze nke mba ọzọ nēme ha dika ndi nwe ha; ndi nāchi kwa ha ka anākpọ ndi nālu ọlu ọma.
26 Ma unu onwe-unu agaghi-adi otú a: kama onye ka ibe-ya uku n'etiti unu, ya di ka onye bu nwata; onye bu kwa onye-isi, ya di ka onye nēje ozi.