67 Ọ buru na Gi onwe-gi bu Kraist, gwa ayi. Ma Ọ siri ha, Ọ buru na Mu agwa unu, unu agaghi-ekwe ma-ọli:
68 ma ọ buru na Mu aju unu ajuju, unu agaghi-aza ma-ọli.
69 Ma site n'ub͕u a ka Nwa nke madu gānọdu n'aka-nri nke ike Chineke.
70 Ha nile si, Gì onwe-gi bu kwa Ọkpara Chineke? Ọ si ha, Unu onwe-unu si na Mu onwem bu Ya.
71 Ha we si, Ọ̀ bu nkpà àmà gini nākpa ayi ọzọ? n'ihi na ayi onwe-ayi nuru site n'ọnu-Ya.