15 é-è, ọbuná Herod ahugh: n'ihi na o zighachiri Ya nye ayi; le kwa, ọ dighi ihe ọ bula kwesiri ọnwu nke O meworo.
16 Ya mere, m'gādọ Ya aka na nti, we rapu Ya.
17 Ma ọ di ya nkpà irapuru ha otù onye-nkpọrọ n'ememe.
18 Ma ha nile tiri nkpu n'otù, si, Wepu Nwoke a, ma rapuru ayi Barabas:
19 onye atubàra n'ulo-nkpọrọ n'ihi otù nbili imegide ndi-isi ebiliri nime obodo ahu, ya na ib͕u-madu.
20 Pailat we gwa ha okwu ọzọ, ebe ọ nāchọ irapu Jisus;
21 ma ha tiri nkpu, si, Kpọgide Ya n'obe, kpọgide Ya n'obe.