1 Ma n'ubọchi mbu nke ízù ubọchi asa, n'oké isi-ututu, ha biaruru ílì ahu, nēbute uda utọ di iche iche nke ha doziri.
2 Ha we hu nkume ahu na akpọrepuwo ya n'ílì.
3 Ha we ba nime, ma ha ahughi aru nke Onye-nwe-ayi Jisus.
4 O we rue, mb͕e ha nọ n'obi abua n'ihi nka, le, ndikom abua guzoro ha nso n'uwe nēb͕u àmùmà:
5 ma mb͕e ha nātu egwu, nērube kwa iru-ha n'ala, ha si ha, Gini mere unu nāchọ Onye di ndu n'etiti ndi nwuru anwu?