17 O rue n'otù nime ubọchi ahu, na Ya onwe-ya nēzi ihe; ndi-Farisi na ndi-ozizí iwu Moses nānọ kwa Ya nso, ndi siri n'obodo ntà nile nke Galili na Judia na Jerusalem puta: ike nke Onye-nwe-ayi diye-kwa-ra Ya ime ka aru di madu ike.
18 Ma le, ndikom butere otù nwoke akuku-aru-ya nwuru anwu n'elu ihe-ndina: ha we nāchọ uzọ ibubata ya, na itọb͕ọ ya n'iru Ya.
19 Ebe ha nāhughi uzọ ha gēsi bubata ya n'ihi ìgwè madu ahu, ha we rigo n'elu ulo, we si n'okpukpu ulo buda ya na ute-ya n'etiti n'iru Jisus.
20 Mb͕e Ọ huru okwukwe-ha, Ọ si, Nwoke, ab͕agharawo gi nmehie-gi nile.
21 Ndi-ode-akwukwọ na ndi-Farisi we malite itule n'obi-ha, si, Ònye bu Nwoke a nke nēkwu okwu nkwulu? Ònye puru ib͕aghara nmehie, ma-ọbughi nání Chineke?
22 Ma ebe Jisus mazuru ihe ha nātule n'obi-ha, Ọ za, si ha, Gini mere unu nātule ihe n'obi-unu?
23 Òle nke ka nfé, isi, Ab͕agharawo gi nmehie-gi nile; ma-ọbu isi, Bilie, jeghari kwa?