27 Nwoke a bu onye edeworo ihe n'akwukwọ nsọ bayere ya, si,Le, Mu onwem nēziga onye-ozim n'iru Gi,Onye gēmezi uzọ-Gi n'iru Gi.
28 Asim unu, N'etiti ndi ndinyom muru ọ dighi onye ka Jọn uku: ma onye dikariri ntà n'ala-eze Chineke ka ya uku.
29 Mb͕e ndi-Ju nile nuru Ya, ha na ndi-ọna-utu, ha we gua Chineke n'onye ezi omume, ebe ejiri baptism nke Jọn me ha baptism.
30 Ma ndi-Farisi na ndi-iwu juru n'onwe-ha ìzù Chineke, ebe ọ nēmeghi ha baptism.
31 Gini kwa ka M'gēji madu nke ọbọ a tuyere, gini kwa ka ha yiri?
32 Ha yiri umu-ntakiri ndi nānọdu n'ọma-ahia, nākpọ kwa ibe-ha òkù; ndi nāsi, Ayi b͕uru unu ọ̀jà, ma unu eteghi egwú; ayi kwara ákwá, ma unu etighi mkpu ákwá.
33 N'ihi na Jọn Baptist abiawo nērighi achicha nāṅughi kwa manya-vine; unu we si, O nwere mọ ọjọ.