33 N'ihi na Jọn Baptist abiawo nērighi achicha nāṅughi kwa manya-vine; unu we si, O nwere mọ ọjọ.
34 Nwa nke madu abiawo nēri ihe-oriri nāṅu kwa ihe-ọṅuṅu; unu we si, Le, onye-ori-nke-uku, na onye-oké-ọṅu-manya, enyì ndi-ọna-utu na ndi-nmehie!
35 Agukwara amam-ihe n'onye ezi omume site n'umu-ya nile.
36 Otù onye n'etiti ndi-Farisi we kpere Ya ka O so ya rie ihe. O we ba n'ulo onye-Farisi ahu, we nọdu na nri.
37 Ma le, otù nwanyi nke nọ n'obodo ahu, bú onye-nmehie; mb͕e ọ mara nke-ọma na Ọ nọduru na nri n'ulo onye-Farisi ahu, o we weta ite alabaster nke manu-otite di ya nime,
38 we guzo n'azu n'ukwu-Ya, nākwa ákwá, we malite iwere anya-miri-ya desa ukwu-Ya abua, o were kwa agiri-isi-ya hicha ha, o we sutu ukwu-Ya ọnu nke-uku, were manu-otite ahu te ha.
39 Ma mb͕e onye-Farisi nke kpọrọ Ya huru ya, o kwue n'onwe-ya, si, Nwoke a, asi na Ọ bu onye amuma, Ọ gāmara onye nwanyi a bu nke nēmetu Ya aka, na aha madu ọ bu, na ọ bu onye-nmehie.