47 N'ihi nka asim i, Ab͕agharaworo ya nmehie-ya, nke di ọtutu; n'ihi na ọ hurum n'anya nke-uku: ma onye ab͕aghara ihe ntà, onye ahu nāhu n'anya nke-ntà.
48 O we si nwayi ahu, Ab͕agharaworo gi nmehie nile gi.
49 Ndi ha na Ya nọduru na nri we malite isirita onwe-ha, Ònye bu Onye a, Nke nāb͕aghara kwa nmehie?
50 O we si nwanyi ahu, Okwukwe-gi azọputawo gi; la n'udo.